Song of Solomon 1

1Abụ nke abụ nke Solomọn.

Onye a hụrụ nʼanya

2Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.
3Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.
4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.
Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.
Ndị Enyi

Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya.
Onye a hụrụ nʼanya

Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.

5Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda
Ndị Keda bụ otu ebo nʼetiti ndị Arab, obodo ha dị na ndịda ọdịda anyanwụ Edọm. Ha na-ebi nʼụlọ ikwu e ji ajị ewu ojii wuo

dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.
6Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.
Ọ bụ anwụ gbajiri m.
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.
7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,
ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?
Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?
Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu
nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.
Ndị Enyi

8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,
soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ
meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa
dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya

9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya
e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.
10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma,
olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.
11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo,
nke e ji ọlaọcha chọọ mma.
Onye a hụrụ nʼanya

12Mgbe eze nọ na tebul ya,
mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.
13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá
Ụda máá bụ eso e ji eme ihe otite na-esi isi ụtọ. A na-ewepụta eso ndị a nʼosisi Balsam nke na-eto nʼobodo Kush, nʼetiti ọwụwa anyanwụ nakwa India.
e kechiri nʼakpa
nke dị nʼetiti ara m abụọ.
14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna
Okoko osisi henna bụ ahịhịa isi ọma a na-eji emepụta senti.

nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.
Bụ odo mmiri dị nʼọdịda osimiri nwụrụ anwụ. Ọtụtụ osisi nke a na-esi na ha enweta eso na-esi isi ọma, jupụtara nʼebe ahụ.

Onye hụrụ ibe ya nʼanya

15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.
Leenụ ka ị si maa mma!
Anya gị dịka nduru.
Onye a hụrụ nʼanya

16Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.
E, ị mara mma.
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya

17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,
ntuhie ya bụkwa osisi fịa.
Copyright information for IboBIU